2
Igwe igurube
Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn.
Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m.
 
Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji,
nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa,
ọ na-abịaru nso.
Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu.
Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị.
Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ.
Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu.
Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ,
a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
 
Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu,
ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ.
Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden,
ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu,
o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya,
ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.
Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala
na-arịgo elu ugwu.
Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
 
Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.
Ihu ha na-agbarụkwa.
Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.
Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.
Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,
ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
Ha na-enukwasị obodo,
na-agbagharị nʼelu mgbidi,
na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ;
na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
 
10 Ala na-ama jijiji nʼihu ha,
eluigwe na-emekwa mkpọtụ.
Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị,
kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
11 Olu Onyenwe anyị dara
nʼihu ndị agha,
ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ,
ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya.
Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu
bụrụkwa ihe dị egwu.
Onye pụrụ ịnagide ya?
Lọghachikwute m
12 “Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
 
13 Dọwakwaanụ obi unu,
ọ bụghị uwe unu.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.
Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.
Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
14 Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,
hapụrụ anyị ngọzị ya,
kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ
maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
 
15 Fụọ opi ike nʼime Zayọn.
Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọkọta nzukọ dị nsọ.
16 Chịkọtaa onye ọbụla,
doo nzukọ ahụ nsọ,
ma ndị okenye,
ma ụmụntakịrị,
ma ụmụ na-aṅụ ara.
Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya,
ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
17 Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi,
nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa.
Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị.
Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta,
nʼetiti mba dị iche iche.
Ekwela ka ha sị,
‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”
Ọsịsa Onyenwe anyị
18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya,
nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.
19  Onyenwe anyị zaghachiri ha sị,
“Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ.
Agaghị m emekwa
ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.
 
20 “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya,
m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu.
Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ;
ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ.
Isisi ọjọọ ya ga-esipụta,
isisi nke ure ya ga-arịgokwa.”
 
Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.
21 Atụkwala egwu, gị ala Juda,
kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,
nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.
22 Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile,
nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ.
Osisi na-amị mkpụrụ ha,
osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.
23 Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ,
ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu.
Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị,
nʼihi ịdị mma ya.
Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo,
nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.
24 Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,
ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
 
25 “Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri,
ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta,
na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri,
bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
26 Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,
unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
27 Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel.
Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
na ọ dịkwaghị onye ọzọ.
Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
Ụbọchị Onyenwe anyị
28 “Ma emesịa,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.
Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
29 Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m
ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
30 Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe,
na nʼelu ụwa;
a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
31 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
32 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị
ka a ga-azọpụta.
Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem
ka mgbapụta ga-adị,
dịka Onyenwe anyị kwuru ya.
Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ,
bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.