Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga
Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
 
Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,* 114:3 Ọpụ 14:21
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ 114:3 Jos 3:12-16;
Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
 
Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
 
Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri. 114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4

*Abụ Ọma 114:3 114:3 Ọpụ 14:21

Abụ Ọma 114:3 114:3 Jos 3:12-16

Abụ Ọma 114:8 114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4