17
Ozi e ziri banyere Damaskọs
1 Nke a bụ amụma megide Damaskọs,* 17:1 Jen 14:15; 15:2; 2Ez 16:9; Jer 49:23; Ems 1:3-5; Zek 9:1; Ọrụ 9:2 isi obodo Siria.
“Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ,
kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.
2 Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,
ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu,
ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.
3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,
ya na ike alaeze nke sị Damaskọs,
ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka
ebube nke ndị Izrel,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
4 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.
Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.
5 Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,
na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha
dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka
nʼime Ndagwurugwu Refaim.
6 Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,
dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv,
hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu,
maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.
7 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,
nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.
8 Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.
Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.† 17:8 Aịz 2:8; 31:7
Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,‡ 17:8 Ashera bụ chi nwanyị ndị Kenan. Ọ bụ osisi ka e ji egosipụta oyiyi ya na ọtụtụ ebe ịchụ aja ya. Nkp 3:7; Dit 12:3; 16:21
maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.
9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
10 Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
11 ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,
nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
12 Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,
nke yiri mkpọtụ oke osimiri.
Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;
ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,
ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.
A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,
na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
14 Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,
tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa.
Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike.
E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.