24
Izrel dịka ite e sikwasịrị nʼọkụ
O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya
kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya.
Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya.
Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,
kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ,
mee ya ka ọ gbọọ nke ọma,
sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
 
“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.
E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,
nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.
Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.
Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
 
“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.
Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.
Ọ bụghị nʼelu ala efu,
ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
 
“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa.
12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya
emeghị ka ọ gbazee.
13 “ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
 
14 “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
Ọnwụ nwunye Izikiel
15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta. 17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.* 24:21 Ga-anwụ site na mma agha 22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri. 23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu. 24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, 26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere. 27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

*24:21 24:21 Ga-anwụ site na mma agha