Ekiliziastis  
 1
Ọ nweghị ihe nwere isi 
 1 Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem. 
 2 Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu 
ka onye ozizi na-ekwu. 
Ihe na-enweghị isi* 1:2 Maọbụ, ihe efu Abụ 144:4. ka ihe niile bụ. 
Ihe niile bụ nnọọ ihe efu. 
 3 Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile 
ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? 
 4 Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, 
ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. 
 5 Anyanwụ na-awa, na-adakwa, 
ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. 
 6 Ifufe na-efe gaa na ndịda; 
feekwa gburugburu gaa nʼugwu, 
ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; 
na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. 
 7 Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri 
ma oke osimiri ejughị eju. 
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, 
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. 
 8 Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; 
ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. 
Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. 
Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị. 
 9 Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. 
Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. 
Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ. 
 10 Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, 
“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? 
Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, 
nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị. 
 11 Anaghị echeta ndị mgbe ochie, 
otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa 
ndị ga-eso ha 
agakwaghị echeta ha. 
Amamihe enweghị isi 
 12 Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.  13 Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?  14 Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe. 
 15 Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie. 
Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ. 
 16 Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”  17 Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe. 
 18 Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta, 
oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.