16
Devid na Ziba
1 Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
2 Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?”
Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
3 Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?”
Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ”
4 Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.”
Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.”
Shimei abụọ Devid ọnụ
5 Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim,* 16:5 2Sa 3:16 lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei† 16:5 2Sa 19:21; 1Ez 2:8,44-46 nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya. 6 Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe. 7 Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ! 8 Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”
9 Abishai, nwa Zeruaya‡ 16:9 Zeruaya bụ nwanne nwanyị Devid, ya mere Joab na Abishai bụ ụmụ nwanne ya. gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”
10 Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ”
11 Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m. 12 Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”
13 Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ. 14 Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.
Ndụmọdụ Hushaị na Ahitofel
15 Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya. 16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”
17 Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”
18 Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ Onyenwe anyị na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere. 19 Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!”
20 Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
21 Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.” 22 Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile.
23 Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.